John 12:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọtụtụ mmadụ weere igu nkwụ pụọ izute ya. Ha na-eti mkpu na-asị, “Hozaana! Ngọzi dịrị eze Izirel! Ngọzi dịrị Onye ahụ na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị.”
Igbo 2006
ha chiri igu nkwu, pua izute Ya, we nēti nkpu, si, Hosanna: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi, bú Eze nke Israel.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha weere igu nkwụ pụọ izute ya na-eti mkpu, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Ngọzị dịrị eze Izrel!”