John 12:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌoge ahụ, ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị na Jisọs na-emezu ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ. Ọ bụ nanị mgbe Jisọs laghachiri nꞌeluigwe, ka ha chọpụtara na ọtụtụ ihe ndị amụma dere banyere ya mezuru.
Igbo 2006
Ihe ndia ndi nēso uzọ-Ya amaghi na mbu: kama mb͕e enyereri Jisus otuto, mb͕e ahu ka ha chetara na edereri ihe ndia bayere Ya n'akwukwọ nsọ, na ha me-kwa-ra Ya-ri ihe ndia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Na mbụ ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ndị a niile. Ma mgbe e nyesịrị Jisọs otuto, ka ha chetara na-edererị ihe ndị a banyere ya, na e mekwara ya rịị ihe ndị a.