John 12:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị nọ mgbe Jisọs mere ka Lazarọs si nꞌọnwụ bilie, gwakwara ndị ọzọ banyere ya.
Igbo 2006
Ya mere ìgwè madu ahu ndi ha na Ya nọ mb͕e O siri n'ílì kpọputa Lazarọs, me kwa ka o si na ndi nwuru anwu bilie, ha nāb͕a àmà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Igwe mmadụ ahụ bụ ndị ya na ha nọ mgbe o si nʼili kpọpụta Lazarọs, mee ka o sị nʼọnwụ bilie, gara nʼihu na-agba ama ya.