John 12:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Eziokwu ka m na-agwa unu. Mkpụrụ ọka apụghị ịmị mkpụrụ karịakwa ma ọ dabara nꞌala nwụọ. Ma o meghị otu a ọ pụghị ịmị mkpụrụ. Kama ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị mkpụrụ hie nne.
Igbo 2006
N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na nkpuru ọka adaghi n'ala we nwua, nání ya onwe-ya nānọgide; ma ọ buru na ọ nwuru, ọ mia ọtutu nkpuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka wiiti adaghị nʼala nwụọ, ọ ga-anọ naanị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị ọtụtụ mkpụrụ.