John 12:26 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ijere m ozi, ya so m. Ndị ozi m ga-anọkwa nꞌebe mụ onwe m nọ. Ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla abụrụ onyeozi m, Nna m ga-asọpụrụ ya.
Igbo 2006
Ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya som; ebe Mu onwem nọ kwa, n'ebe ahu ka onye nējerem ozi gānọ kwa: ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya ka Nnam gāsọpuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ọbụla na-ejere m ozi aghaghị iso m; ebe m nọ ka onye na-ejere m ozi ga-anọkwa. Onye ọbụla na-ejere m ozi ka Nna m ga-asọpụrụ.