John 12:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ, Meri weere mmanụ dị oke ọnụ ahia tee Jisọs nꞌụkwụ. O jikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ Jisọs. Nke a mere ka ụlọ ahụ jupụta nꞌisi mmanụ oke ọnụ ahia ahụ.
Igbo 2006
Ya mere Meri were manu-otite ezi nard, di oké ọnu-ahia nke-uku, nke ọtùtù-ya ruru otù pound, te ukwu Jisus abua, were kwa agiri-isi-ya hicha ukwu-Ya: ísì manu-otite ahu we juputa ulo ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Meri weere mmanụ otite dị ọkara lita nke ezigbo naad, mmanụ isi ụtọ dị oke ọnụahịa, ọ wụkwasara ya Jisọs nʼụkwụ, jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Nke a mere ka ụlọ ahụ jupụta nʼisi ụtọ nke mmanụ otite ahụ.