John 12:34 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị mmadụ jụrụ ya sị. “A na-akuziri anyị nꞌime akwụkwọ iwu na onye ahụ bụ Onye nzọpụta agaghị anwụ anwụ. Na ọ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Gịnị mere i ji na-asị na Onye nzọpụta ga-anwụ?”
Igbo 2006
Ya mere ìgwè madu ahu zara Ya, si, Ayi onwe-ayi nuru site n'iwu-ayi na Kraist-ayi nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi: Gì onwe-gi si kwa aṅa si, Aghaghi iweli Nwa nke madu elu? Ònye bu Nwa nke madu a?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Igwe mmadụ ahụ zara ya, “Anyị anụla site nʼakwụkwọ iwu na Kraịst ahụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma gịnị mere i ji asị na, ‘A ghaghị iweli Nwa nke Mmadụ elu’? Onye bụ ‘Nwa nke mmadụ a’?”