John 12:35 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs zara ha sị, “Ìhè m nwere nanị nwa oge nta ọ ga-enwuru unu. Jegharịanụ nꞌìhè a, ugbu a unu nwere ya ka ọchịchịrị hapụ ịbịakwasị unu. Nꞌihi na onye ọ bụla na-ejegharị nꞌọchịchịrị amaghị ebe ọ na-aga.
Igbo 2006
Ya mere Jisus siri ha, Nwa oge fọduru ka Ìhè ahu gādi n'etiti unu. Nējegharinu mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, ka ọchichiri ghara ijide unu: onye nējeghari n'ọchichiri adighi-amata ebe ọ nēje.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs sịrị ha, “Ìhè ga-enwuru unu naanị nwa oge nta. Jegharịanụ nʼìhè a, ugbu a unu nwere ya, tupu ọchịchịrị abịakwasị unu. Onye na-ejegharị nʼọchịchịrị amaghị ebe ọ na-aga.