John 12:42 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ụfọdụ nꞌime ndị isi nchụaja kweere na ya. Ma ha ekwupụtaghị nke a. Nꞌihi na ha tụrụ egwu ndị Farisii. Ha achọkwaghị ka achụpụ ha site nꞌụlọ ekpere ndị Juu.
Igbo 2006
Otú ọ di, ọbuná site n'etiti ndi-isi ọtutu kwere na Ya; ma n'ihi ndi-Farisi ha ekwuputaghi ya, ka aghara ichupu ha n'ulo-nzukọ:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu ọ dị, ọtụtụ nʼime ndịisi kweere na ya, ma ha ekwupụtaghị nke a. Nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị Farisii ga-achụpụ ha site nʼụlọ ekpere.