John 12:48 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Onye ọ bụla jụrụ m, jụkwa ozi m, nwere onye na-ekpe ya ikpe. Okwu nile m kwuru ka a ga-eji kpee ya ikpe.
Igbo 2006
Onye nājum, nke nādighi-anara kwa okwum, o nwere onye nēkpe ya ikpé: okwu nke M'kwuru, okwu ahu gēkpe ya ikpé n'ubọchi ikpe-azu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ọbụla jụrụ m ma jụkwa okwu m, nwere onye ga-ekpe ya ikpe. Okwu niile m kwuru ga-ama ya ikpe nʼụbọchị ikpeazụ.