John 12:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma Judas ekwughị nke a nꞌihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya nꞌobi. Kama Judas bụ onye na-eche ego ndị na-eso ụzọ Kraịst. Mgbe ụfọdụ, ọ naamanye aka nꞌego ahụ zụfuo nꞌonwe ya.
Igbo 2006
Ma nka ka o kwuru, ọ bughi n'ihi na ọ kpọrọ ndi-ob͕eye ihe; kama n'ihi na ọ bu onye-ori, na ebe o ji àkpà-ego, ọ nēwepu ihe anētiye nime ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O kwughị nke a nʼihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya nʼobi kama nʼihi na ọ bụ onye ohi; dị ka onye na-ejide akpa ego ha, mgbe ụfọdụ, ọ na-amanye aka nʼego ahụ zubiri ego.