John 13:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ọ bụghị unu nile ka m na-agwa okwu a. Ọ bụ m họpụtara unu. Amakwaara m unu nꞌotu nꞌotu. Akwụkwọ nsọ sịrị na onye ahụ mụ na ya rikọrọ nri ga-arara m nye. Nke a ga-emekwa nꞌoge na-adịghị anya.
Igbo 2006
Ekwughm okwu bayere unu nile: Mu onwem matara ndi M'rọputara: kama ọ bu ka emezu ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Onye nēri nrim buliri ikiri-ukwu-ya imegidem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Anaghị m ekwu maka unu niile, amaara m ndị m họpụtara. Ma nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ‘Onye mụ na ya na-erikọ nri ebiliela megide m.’