John 13:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Jisọs kwusịrị okwu a, o nweghị udo nꞌime mmụọ ya. Ọ gwara ha sị, “Nꞌezie, otu onye nꞌime unu ga-arara m nye.”
Igbo 2006
Mb͕e Jisus kwusiri okwu ndia, obi lọrọ Ya miri nime mọ-Ya, O we b͕a àmà, si, N'ezie, n'ezie, asim unu, na otù onye n'etiti unu gāraram nye.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Jisọs kwusiri ihe ndị a, o nweghị udo nʼime mmụọ ya. Ọ gbara ama sị, “Nʼezie, nʼezie, a sị m unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.”