John 13:26 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs sịrị ya, “Aga m esuru achịcha a nꞌime ofe. Onye ọ bụla m nyere ya, onye ahụ bụ onye ga-arara m nye.” Jisọs suuru achịcha ahụ nꞌime ofe nye ya Judas nwa Saịmọn Iskarịọt.
Igbo 2006
Ya mere Jisus za, si, Ọ bu onye ahu, nke Mu onwem gēsuru iberibe achicha n'ofé, nye ya. Ya mere, mb͕e O susiri iberibe achicha ahu, O were ya nye Judas, nwa Saimon Iskariot.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs zara, “Ọ bụ onye ahụ m ga-enye iberibe achịcha a mgbe m sunyere ya nʼime efere nri.” Mgbe o sunyesịrị achịcha ahụ nʼime efere ahụ, o nyere ya Judas nwa Saimọn Iskarịọt.