John 13:29 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ụfọdụ chere na Jisọs gwara Judas ka ọ gaa kwụọ ụgwọ nri ha riri ma ọ bụ ka ọ gaa nye ndị ogbenye ego. Nꞌihi na Judas bụ onye na-eche ego ha.
Igbo 2006
N'ihi na ufọdu nēchè, ebe Judas ji àkpà-ego, na Jisus siri ya, Zuta ihe di ayi nkpà n'ememe; ma-ọbu, ka o nye ndi-ob͕eye ihe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ụfọdụ na-eche, ebe Judas ji akpa ego ha, Jisọs na-asị ya ka ọ gaa zụta ihe ndị dị mkpa maka mmemme, maọbụ ka ọ gaa nye ndị ogbenye ihe.