John 13:33 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ụmụntakịrị m, enwere m oge ntakịrị nke mụ na unu ga-anọ. Aga m ala hapụ unu. Site ugbu a gaa nꞌihu unu ga-achọ m ma unu agaghị ahụ m. Nke a bụkwa ihe m gwara ndị Juu.
Igbo 2006
Umu-ntakiri, ọ fọduru nwa oge Mu na unu gānọ. Unu gāchọm: dika M'gwa-kwa-ra ndi-Ju, si, Ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia; otú ahu ka M'nāsi unu ub͕u a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ụmụntakịrị m, enwere m oge ntakịrị nke mụ na unu ga-anọ. Unu ga-achọ m, ma dị ka m gwara ndị Juu ka m na-agwa unu ugbu a. Ebe m na-aga unu enweghị ike ịbịa ya.