John 13:34 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Nꞌihi na m na-ahapụ unu, ana m enye unu iwu ọhụrụ. Hụritaanụ onwe unu nꞌanya dị ka m siri hụ unu nꞌanya.
Igbo 2006
Iwu ọhu M'nēnye unu, ka unu hurita ibe-unu n'anya; dika M'huru unu n'anya, ka unu onwe-unu hurita kwa ibe-unu n'anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ana m enye unu iwu ọhụrụ: Hụrịtanụ onwe unu nʼanya. Dị ka m hụrụ unu nʼanya, otu a ka unu ga-esi hụrịta onwe unu nʼanya.