John 13:36 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Saịmọn Pita sịrị, “Nna anyị ukwu, olee ebe ị na-aga?” Jisọs sịrị, “Ị pụghị iso m gaa ebe m na-aga ugbu a. Kama emesịa, ị ga-abịa.”
Igbo 2006
Saimon Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, Òle ebe I nāla? Jisus zara, si, Ebe M'nāla, i pughi isom ub͕u a; ma i gēsom ma emesia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Saimọn Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị ebee ka ị na-aga?” Jisọs zaghachiri ya, “Ebe m na-aga, i nweghị ike iso m gaa ya ugbu a. Ma ị ga-abịa ma emesịa.”