John 14:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Nꞌeziokwu, ana m agwa unu sị, onye ọ bụla tụkwasịrị m obi ga-enwe ike mee ihe ndị a nile. Ọ ga-enwekwa ike ime karịa ihe ndị a nꞌihi na m na-alakwuru Nna m.
Igbo 2006
N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nēkwere na Mu, ọlu Mu onwem nālu ka onye ahu gālu kwa; ọlu ka ndia uku ka ọ gālu kwa; n'ihi na Mu onwem nāgakuru Nnam.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla kwere na m ga-arụ ọrụ ndị m rụrụ, rụọkwa ọrụ karịrị ndị a, nʼihi na m na-alakwuru Nna m.