John 14:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Onye na-anabata ihe m nyere nꞌiwu ma na-edebekwa ya bụ onye hụrụ m nꞌanya. Onye hụrụ m nꞌanya ka Nna m ga-ahụ nꞌanya. Aga m ahụkwa ya nꞌanya gosikwa ya onwe m.”
Igbo 2006
Onye nwere ihe M'nyere n'iwu, nke nēdebe kwa ha, ọ bu onye ahu nāhum n'anya: onye nāhum n'anya, Nnam gāhu kwa ya n'anya, Mu onwem gāhu kwa ya n'anya, were kwa Onwem gosi ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ọbụla nabatara iwu m ma na-edebekwa ha bụ onye hụrụ m nʼanya. Onye hụrụ m nʼanya ka Nna m ga-ahụ nʼanya. Aga m ahụkwa ya nʼanya gosikwa ya onwe m.”