John 14:28 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Unu nụrụ na m gwara unu okwu sị, ‘Aga m ahapụ unu, emesịa aga m alaghachikwute unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nꞌanya unu gaara aṅụrị ọṅụ. Nꞌihi na m na-alakwuru Nna m. Nna m dịkwa ukwuu karịa m.
Igbo 2006
Unu nuru na Mu onwem siri unu, Anamala, biakute kwa unu. Ọ buru na unu hurum n'anya, unu gāṅuwori ọṅu, n'ihi na anamagakuru Nnam: n'ihi na Nnam ka Mu onwem uku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Unu anụla na m gwara unu, ‘Ana m ala, ma lọghachikwutekwa unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya, unu gaara aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna, nʼihi na Nna dị ukwuu karịa m.