John 14:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs zara ya sị, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ̀ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọ bụla hụrụ m ahụla Nna ahụ. Gịnị mere i ji na-asị m, ‘Zi m Nna ahụ?’
Igbo 2006
Jisus si ya, Ogologo oge di otú a ka Mu na gi nọ, ma ì mataghm, Filip? onye huworom anya ahuwo Nnam anya; gì onwe-gi si aṅa si, Gosi ayi Nnam ahu?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs sịrị ya, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọbụla hụrụ m ahụla Nna. Olee otu i si asị, ‘zi anyị Nna ahụ?’