John 15:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Unu ga-anọgide nꞌịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe nile m nyere unu nꞌiwu. Mụ onwe m na-anọgidekwa nꞌịhụnanya nke Nna m nꞌihi na m naedebe ihe nile o nyere nꞌiwu.
Igbo 2006
Ọ buru na unu edebe ihe nile M'nyere n'iwu, unu gānọgide n'ihu-n'anyam; dika Mu onwem debeworo ihe nile Nnam nyere n'iwu, nọgide kwa n'ihu-n'anya-Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu ga-anọgide nʼịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe iwu m. Dị ka m debere iwu Nna m ma nọgidekwa nʼịhụnanya ya.