John 15:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ọ bụkwaghị unu onwe unu họpụtara m. Ọ bụ m họpụtara unu ka unu baa nꞌime ụwa mịa mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgide. Ya mere, ọ bụrụ na unu arịọọ Nna m ihe ọ bụla site nꞌaha m, Nna m ga-enye unu ihe nile unu rịọrọ.
Igbo 2006
Ọ bughi unu onwe-unu rọputaram, kama ọ bu Mu onwem rọputara unu, weputa kwa unu iche, ka unu onwe-unu we je mia nkpuru, ka nkpuru-unu we nọgide kwa: ka ihe ọ bula unu gāriọ Nnam n'aham, ka O we nye unu ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụkwaghị unu onwe unu họọrọ m. Ọ bụ m họọrọ unu, wepụtakwa unu iche ka unu gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgidekwa. Ya mere, Nna m ga-enye unu ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼaha m.