John 15:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Unu chetakwa ihe m gwara unu malite na mbụ, na ohu adịghị ukwuu karịa onyenwe ya. Nꞌihi nke a ebe ụwa kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ha agaghị erube isi nꞌokwu unu, nꞌihi na ha erubeghị isi nꞌihe m ziri ha.
Igbo 2006
Chetanu okwu Mu onwem gwara unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku. Ọ buru na ha sob͕urum, ha gēsọb͕u kwa unu; ọ buru na ha debere okwum, ha gēdebe kwa nke unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Chetakwanụ ihe m gwara unu, ‘Ohu adịghị adị ukwuu karịa Onyenwe ya.’ Ya mere, ebe ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu.