John 15:26 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ma Onye ndụmọdụ ahụ ga-abịa, Onye ahụ bụ Mmụọ eziokwu ahụ, Onye ga-esite nꞌebe Nna m nọ bịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-akọwara unu ihe nile banyere m.
Igbo 2006
Ma mb͕e ọ bula Onye-nkasi-obi ahu gābia, Onye Mu onwem gēsi n'ebe Nnam nọ zitere unu, bú Mọ nke ezi-okwu, Onye si na Nnam puta, Onye ahu gāb͕aram àmà:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mgbe Onye Ndụmọdụ ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m.