John 15:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Onye ọ bụla na-adịghị anọgide nꞌime m abaghị uru ọ bụla nye m. A na-atụpụkwa ya nꞌezi ka ọ kpọnwụọ, dị ka alaka osisi e gbuturu egbutu. Ọ bakwaghị uru ọzọ ma ọ bụghị ka e tinye ya nꞌọkụ, ka o ree ọkụ.
Igbo 2006
Ọ buru na onye ọ bula anọgideghi nimem, atupu ya n'èzí dika alaka, ọ kpọnwu kwa; ha we chikọta ha, tubà ha n'ọku, ewe rechapu ha ọku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼime m dị ka alaka e gbuturu, tụpụ ya, ọ kpọnwụọ. A ga-achịkọta ya, chịnye ya nʼọkụ, o repịa.