John 15:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na unu amịa mkpụrụ, a ga-esite na mkpụrụ ahụ nye Nna m otuto. Nꞌụzọ dị otu a ka unu ga-eji bụrụ ndị na-eso ụzọ m.
Igbo 2006
Nime nka ka anēnye Nnam otuto, ka unu nāmi nkpuru ri nne; unu gābu kwa ndi nēso uzọm.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a ga-abụrụ Nna m otuto na unu mịrị ọtụtụ mkpụrụ hie nne, ọ na-egosikwa na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.