John 16:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Mmụọ nke eziokwu ahụ na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-eduba unu nꞌeziokwu nile. Ọ gaghị ekwu ihe banyere onwe ya. Kama ọ bụ ihe nile ọ nụrụ nꞌọnụ m ka ọ ga-ekwu. Ọ ga-ezikwa unu ihe nile nke na-aghaghị ime.
Igbo 2006
Ma mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, bú Mọ nke ezi-okwu, Ọ gēdubà unu n'ezi-okwu nile: n'ihi na Ọ gaghi-ekwu n'Onwe-ya; kama ka ihe Ọ nānu ra, ihe ndia ka Ọ gēkwu: Ọ gākọ-kwa-ra unu ihe nile nke nābia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe Mmụọ eziokwu ahụ bịara, ọ ga-eduba unu nʼeziokwu niile. Ọ gaghị ekwu ihe banyere onwe ya, kama ọ bụ ihe niile ọ nụrụ ka ọ ga-ekwu. Ọ ga-ezikwa unu ihe niile gaje ịbịa.