John 16:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs matara ihe dị ha nꞌobi. Ọ maara na ha chọrọ ka a kọwaara ha. Nꞌihi ya, ọ sịrị ha, “Ùnu na-ajụrịta onwe unu ihe banyere okwu m kwuru?
Igbo 2006
Jisus mara na ha nāchọ iju Ya, O we si ha, Ùnu nājurita onwe-unu ihe bayere nka, na M'siri, Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam ọzọ; ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs matara na ha chọrọ ịjụ ya ihe banyere nke a, nʼihi ya ọ sịrị ha, “Unu na-ajụrịta onwe unu ihe okwu m pụtara mgbe m sịrị, ‘Na nwa oge nta unu agaghị ahụkwa m ọzọ, ma nwa mgbe nta unu ga-ahụkwa m’?