John 16:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Unu nọ nꞌọnọdụ iru uju ugbu a. Ma mgbe nwantịntị oge gasịrị, aga m ahụ unu anya ọzọ. Mgbe ahụ unu ga-aṅụrị ọṅụ. Mmadụ ọ bụla apụkwaghị ịnapụ unu ọṅụ unu mgbe ahụ.
Igbo 2006
Ya mere unu onwe-unu nēnwe kwa ihe-nwuta ub͕u a: ma M'gāhu unu ọzọ, obi-unu gāṅuri kwa ọṅu, ọ dighi kwa onye ọ bula gānara unu ọṅù-unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu nọ nʼọnọdụ iru ụjụ ugbu a, ma aga m ahụ unu anya ọzọ, obi unu ga-ejupụta nʼọṅụ. Mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụ unu ọṅụ unu.