John 16:30 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ugbu a ka o doro anyị anya na ị maara ihe nile. Ọ bakwaghị uru ka onye ọ bụla gwa gị ihe ọ bụla. Nꞌihi nke a anyị kweere na i si nꞌebe Chineke nọ bịa.”
Igbo 2006
Ub͕u a ayi nāmata na I matara ihe nile, na ọ dighi kwa Gi nkpà ka onye ọ bula jua Gi: nka ka ayi ji kwere na I siri n'ebe Chineke nọ puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a ka o doro anyị anya na ị maara ihe niile. Ọ bakwaghị uru ka onye ọbụla jụọ gị ihe ọbụla. Nʼihi nke a, anyị kwere na i si nʼebe Chineke nọ bịa.”