John 16:32 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Lee! Oge na-abịa, nꞌezie oge ahụ eruola mgbe a ga-eme ka unu gbasasịa. Onye ọ bụla nꞌụzọ nke aka ya. Mgbe ahụ unu ga-ahapụ nanị m. Ma ọ bụghị nanị m ga-anọ nꞌihi na mụ na Nna m ga-anọ.
Igbo 2006
Le, oge hour nābia, ọ biawo kwa, ka unu gāb͕asa, onye ọ bula ọ la na nke ya, unu gārapu kwa nání Mu: otú ọ di, nání Mu anọghi, n'ihi na Mu na Nnam nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Lee! Oge na-abịa, oge ahụ eruola, mgbe unu ga-agbasacha. Onye ọbụla nʼụlọ nke ya. Mgbe ahụ, unu ga-ahapụ naanị m, ma ọ bụghị naanị m nọ nʼihi na mụ na Nna m nọ.