John 16:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌezie, ọ dị mkpa ka m hapụ unu laa. Ọ bụrụ na m alaghị, Onye nkasịobi ahụ agaghị abịa. Ọ bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya.
Igbo 2006
Otú ọ di, Mu onwem nāgwa unu ezi-okwu; Ọ bu ihe bara unu urù ka Mu onwem la: n'ihi na asi na alaghm, Onye-nkasi-obi ahu agaghi-abiakute unu; ma ọ buru na alam, M'gēzite Ya nye unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼagbanyeghị nke a, aga m agwa unu eziokwu, ọ bụ maka ọdịmma unu ka m ji ala. Ọ bụrụ na m alaghị, Onye Ndụmọdụ ahụ agaghị abịa. Ọ bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya.