John 17:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Isi ekpere m nꞌihi ha bụ ka ha nile nwee otu obi na otu mkpebi banyere ihe nile ha ga-eme, dị ka mụ na gị si nwekọọ. Nna, ee, dị ka gị onwe gị dị nꞌime m, dị ka mụ onwe m dịkwa nꞌime gị, achọrọ m ka ndị nile kweere na m nọgide nꞌime anyị. Mgbe ahụ ndị nile nọ nꞌụwa ga-esite nꞌomume dị otu a mata na gị onwe gị zitere m.
Igbo 2006
ka ha nile we buru otù; dika Gi onwe-gi di nimem, dika Mu onwem di kwa nime Gi, Nna, ka ha onwe-ha we di kwa nime Ayi: ka uwa we kwere na Gi onwe-gi ziterem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka ha niile bụrụ otu, Nna, dị ka ị nọ nʼime m mụ a nọrọ nʼime gị. Ka ha nọrọkwa nʼime anyị ka ụwa kwere na ọ bụ gị zitere m.