John 17:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ aga m ebikwa nꞌime ha, gị onwe gị ga-ebikwa nꞌime m. Anyị na ha ga-abụrụ ndị e jikọtara nꞌotu. Ụwa ga-esikwa otu a mata na gị onwe gị zitere m. Ha gaamatakwa na ị hụrụ ndị nile kweere na m nꞌanya, dị ka ị hụrụ m nꞌanya.
Igbo 2006
Mu onwem nime ha, Gi onwe-gi kwa nimem, ka ewe me ka ha buru ndi zuworo okè ibu otù; ka uwa we mara na Gi onwe-gi ziterem, na I hu-kwa-ra ha n'anya, dika I hurum n'anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mụ onwe m nʼime ha, gị onwe gị nʼime m. Ka e mee ka ha bụrụ otu nʼụzọ zuruoke, ka ụwa matakwa na ọ bụ gị zitere m, na ị hụkwara ha nʼanya dị ka ị si hụ m nʼanya.