John 17:24 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Biko Nna m, achọrọ m ka ndị nile kweere na m soro m bikọọ nꞌotu ebe. Ndị ahụ nile i nyere m site nꞌụwa, achọrọ m ka ha hụ otuto m nile, nke i nyere m site nꞌịhụnanya gị, nke i nwere nꞌebe m nọ malite na ntọ ala nke ụwa a.
Igbo 2006
Nna, ihe I nyeworom, anamachọ ka, ebe Mu onwem nọ, ka Mu na ndi ahu nọ kwa; ka ha we hu otutom, nke I nyeworom: n'ihi na I hurum n'anya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nna, achọrọ m ka ndị niile i nyere m soro m nọrọ ebe m nọ. Ka ha hụ otuto m nke i nyere m nʼihi na ị hụrụ m nʼanya tupu atọọ ntọala nke ụwa.