John 18:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gafee iyi ntakịrị a na-akpọ Kidrọn. Ha bịaruru nꞌotu ubi a gbara ogige dị nꞌebe ahụ. Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere nꞌime ubi a.
Igbo 2006
Mb͕e Jisus kwusiri okwu ndia, Ọ pua, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, gabiga n'ofè iyi Kidron, ebe ubi ab͕ara ogige di, nke Ọ bàra nime ya, Ya onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya rịdara ndagwurugwu iyi Kidrọn rigorokwa nʼofe nke ọzọ, ebe e nwere otu ogige, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime ya.