John 18:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Saimọn Pita na otu onye ọzọ na-eso ụzọ Jisọs, nke onyeisi nchụaja maara, sooro Jisọs. Ma ha na-eso ya nꞌazụ site nꞌebe dị anya. Ha sokwa Jisọs baa nꞌime obi onyeisi nchụaja ahụ.
Igbo 2006
Saimon Pita we so Jisus, ya na onye ọzọ nke nēso uzọ Jisus. Ma onye ahu nke nēso uzọ Jisus bu onye onye-isi-nchu-aja mara, o we so Jisus ba n'obí onye-isi-nchu-àjà;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Saimọn Pita na otu onye ọzọ na-eso ụzọ ya sooro Jisọs. Nʼihi na onye nke ahụ na-eso ụzọ ya bụ onye onyeisi nchụaja maara nke ọma, o sooro Jisọs banye nʼobi onyeisi nchụaja.