John 18:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ha bịarutere nꞌobi onyeisi nchụaja ahụ, Pita guzoro nꞌezi nꞌọnụ ụzọ e si abata nꞌime ya. Onye nke ọzọ na-eso ụzọ Jisọs nke onyeisi nchụaja maara, bịara gwa nwagbọghọ na-eche ọnụ ụzọ ihe banyere Pita. Emesịa, ọ kpọbatara Pita.
Igbo 2006
ma Pita nēguzo n'èzí n'ọnu-uzọ. Ya mere onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, onye onye-isi-nchu-àjà mara, we pua gwa nwanyi nke nēche ọnu-uzọ okwu, we dubata Pita.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Pita na-eguzo nʼezi nʼọnụ ụzọ. Onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya, nke onyeisi nchụaja maara nke ọma, pụrụ nʼezi gwa nwaagbọghọ ahụ na-eche ọnụ ụzọ okwu, ma kpọbata Pita.