John 18:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs zara ya sị, “Nꞌihu ọha mmadụ ka m kwuru okwu nile m kwuru. Ekwuru m okwu Chineke nꞌime ụlọ ekpere na nꞌime ụlọ nsọ ukwu Chineke ebe ndị Juu na-ezukọ. Ekwukwaghị m ihe ọ bụla na nzuzo.
Igbo 2006
Jisus zara ya, si, Mu onwem agwawawo uwa okwu; Mu onwem zíri ihe mb͕e nile n'ulo-nzukọ, na n'ulo uku Chineke, ebe ndi-Ju nile nāb͕akọ; ekwukwaghi m ihe ọ bula na nzuzo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs zara ya, “Nʼihu ọha mmadụ ka m kwuru okwu niile m kwuru. A kuziri m ihe nʼime ụlọ ekpere na nʼime ụlọnsọ ukwu ebe ndị Juu na-ezukọ. Ekwukwaghị m ihe ọbụla na nzuzo.