John 18:28 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
E sitere nꞌụlọ Kaịfas duru Jisọs gaa nꞌụlọ Pailet onye na-achị Jerusalem. Ọ bụkwa nꞌisi ụtụtụ ka ha mere nke a. Ma ndị Juu abanyeghị nꞌụlọ Pailet. Ha achọghị imerụ onwe ha nꞌihi na ọ ga-egbochi ha iri nwa atụrụ e gburu e ji mee mmemme Ngabiga.
Igbo 2006
Ya mere ha si na nke Kaiafas duru Jisus ba na Pritoriọm: ọ bu kwa n'isi-ututu; ma ha onwe-ha abàghi nime Pritoriọm ahu, ka aghara imeru ha, kama ka ha we rie oriri ngabiga.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ha sitere nʼụlọ Kaịfas duru Jisọs gaa nʼụlọeze Pailet. Ọ bụkwa nʼisi ụtụtụ, ma ha onwe ha abanyeghị nʼime ụlọeze ahụ nʼihi na ha achọghị imerụ onwe ha, ka ha nwee ike isoro rie nri na Mmemme Ngabiga.