John 18:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị isi nchụaja na ndị Farisii dunyere Judas ụfọdụ ndị agha na ndị uwe ojii. Ndị a ji ọkụ na ngwa agha ha bịa nꞌebe ahụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ.
Igbo 2006
Ya mere Judas, ebe ọ natara òtù ndi-agha, na ndi nēje ozi site n'aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi, ọ chiri oriọna na ọwa na ihe-agha bia n'ebe ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, Judas duuru otu ndị agha, na ụfọdụ ndị ozi sitere nʼetiti ndịisi nchụaja na ndị Farisii bịa nʼebe ahụ. Ha chịkwa ọwaọkụ, oriọna na ngwa agha.