John 18:36 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs zara ya sị, “Abụghị m eze nke ụwa a. A sị na m bụ eze nke ụwa a, ndị na-eso ụzọ m gaara alụ ọgụ ịgbochi ndị Juu ijide m. Ma alaeze m abụghị nke ụwa.”
Igbo 2006
Jisus zara, si, Ala-ezem esiteghi n'uwa nka: ọ buru na ala-ezem sitere n'uwa nka, ndi nējerem ozi gālu ọ̀gù, ka aghara iraram nye n'aka ndi-Ju: ma ub͕u a ala-ezem esighi n'ebe a puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs zara, “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara ịlụrụ m ọgụ iji gbochie m ịdaba nʼaka ndị Juu. Ma ugbu a, alaeze m abụghị nke ụwa a.”