John 18:37 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ Pailet sịrị, “Ọ pụtara na ị bụ eze?” Jisọs zara sị ya, “Otu ahụ ka ọ dị. Amụrị m nꞌihi nke a. Abịakwara m nꞌụwa ịgba ama banyere eziokwu ahụ. Ọ bụkwa ndị ọ bụla hụrụ eziokwu nꞌanya na-ege m ntị.”
Igbo 2006
Ya mere Pailat siri Ya, Gì onwe-gi bu kwa eze? Jisus zara, si, Gi onwe-gi nāsi na Mu onwem bu eze. Amuwo Mu onwem ime ihe a, abiawokwam nime uwa ime ihe a, ka M'we b͕ara ezi-okwu àmà. Onye ọ bula nke sitere n'ezi-okwu ahu nānu olum.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Pailet sịrị ya, “Ya bụ na ị bụ eze?” Jisọs zara, “Gị onwe gị kwuru na m bụ eze. Amụrụ m nʼihi nke a, ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji bi a nʼụwa ịgba ama banyere eziokwu. Onye ọbụla hụrụ eziokwu nʼanya na-ege m ntị.”