John 19:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Okwu a mere ka Pailet chọsie ike ịhapụ Jisọs. Ma ndị isi ndị Juu gwara ya sị, “Ị hapụ nwoke a ka ọ laa, i gosiri na ị bụkwaghị enyi Siza. Nꞌihi na onye ọ bụla na-eme onwe ya eze na-edo onwe ya imegide Siza.”
Igbo 2006
Site na nka Pailat nāchọ uzọ irapu Ya: ma ndi-Ju tiri nkpu, si, Ọ buru na i rapu Onye a, i bughi eyì Sisa: onye ọ bula nke nēme onwe-ya eze nēkwu okwu imegide Sisa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Site na mgbe ahụ Pailet chọsịrị ike ịhapụ ya. Ma ndị Juu tisiri mkpu ike sị, “Ị hapụ nwoke a ka ọ laa, ị bụkwaghị enyi Siza. Nʼihi na onye ọbụla na-eme onwe ya eze na-elelị Siza.”