John 19:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ihe ndị a mere nꞌihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie nꞌụbọchị ọ ga-abụ o jie, bọọ, mmemme Ngabiga ebido. Pailet sịrị ha, “Leenụ eze unu!”
Igbo 2006
Ma ọ bu ubọchi Nkwadebe nke ememe ngabiga: ọ di ka oge hour nke-isi. O we si ndi-Ju, Le, Eze-unu!
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ nʼihe dịka nʼoge ehihie nke ụbọchị nkwadebe maka oriri Ngabiga. Ọ sịrị ndị Juu, “Leenụ eze unu!”