John 19:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ebe a nọkwa kpọgide Jisọs nꞌobe dị nso nꞌobodo Jerusalem. Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe Pailet dere, nꞌihi na o dere ya nꞌasụsụ atọ, Hiburu, Griik na Latin.
Igbo 2006
Ya mere ọtutu n'etiti ndi-Ju guru ihe-ndekwasi ahu: n'ihi na ebe akpọgidere Jisus n'obe di obodo Jerusalem nso: ede-kwa-ra ya n'asusu Hibru, n'asusu Latin, n'asusu Grik.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe a o dere, nʼihi na ebe a kpọgburu Jisọs dị nso nʼobodo ahụ. E dekwara ya nʼasụsụ Hibru, Griik na Latin.