John 19:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Emesịa, ndị isi nchụaja bịakwutere Pailet rịọ ya sị, “Gbanwee ihe i dere nꞌelu obe ahụ. Ị garaghị ede na ọ bụ eze ndị Juu, kama na ọ sịrị, ‘Mụ onwe m bụ Eze ndị Juu!’ ” Ma Pailet gwara ha sị, “Agaghị m agbanwe ihe m dere. Ka ọ dịrị otu m siri dee ya.”
Igbo 2006
Ya mere ndi-isi-nchu-àjà nke ndi-Ju si Pailat, Edela, Eze ndi-Ju; kama, na Onye ahu siri, Abum Eze ndi-Ju.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndịisi nchụaja nke ndị Juu gwara Pailet sị, “Edela na ọ bụ Eze ndị Juu, kama dee na nwoke a sịrị, abụ m eze ndị Juu.”