John 19:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ha gwarịtara onwe ha sị, “Ka anyị hapụ ịdọka uwe a, kama ka anyị fee nza lee onye ọ ga-adanyere iwere ya.” Ma okwu a mezuru ihe e buru nꞌamụma sị, “Ha kere uwe m nꞌetiti onwe ha, feekwa nza banyere uwe mwuda m.” Nke a bụ ihe ha mere.
Igbo 2006
Ya mere ha siritara onwe-ha, Ka ayi ghara idọwa ya, kama ka ayi fere ya nzà, onye ọ gābu nke ya: ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezue, nke si, Ha kère uwem nye onwe-ha, N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha fe-kwa-ra nzà. Ya mere ndi-agha ahu mere ihe ndia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha gwarịtara onwe ha, “Ka anyị hapụnụ ịdọka ya, kama ka anyị fee nza lee onye ọ ga-adanyere i were ya.” Nke a bụ iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ha kere uwe m nʼetiti onwe ha, feekwa nza banyere uwe mwụda m.” Nke a bụ ihe ndị agha ahụ mere.